Jenesis 17

Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.”

Genesis 17:16 (UKJV) And I will bless her, and give you a son also of her: yea, I will bless her, and she shall be a mother of nations; kings of people shall be of her.

14Nwoke ọbụla a na-ebighị ugwu nke anụ ahụ ka a ga-ebipụ site nʼetiti ụmụnna ya. Nʼihi na o mehiela megide ọgbụgba ndụ m.”

15Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera.

16Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.”

17Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?”

18Ebraham gwara Chineke sị, “A sịkwa na ị ga-ekwe mee ka Ishmel bụrụ onye dị ndụ nʼihu gị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.