1Onyenwe anyị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie.
2O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala.
3Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị.