9Ha jụrụ ya sị, “Ebee ka Sera nwunye gị nọ?” Ọ zara sị, “Ọ nọ nʼime ụlọ ikwu.”
10Ọ sịrị ya, “Nʼezie, mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a nʼafọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” Sera guzo nʼime ụlọ ikwu ahụ nke dị nʼazụ Ebraham na-ege ntị nʼihe ha na-ekwu.
11Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa.
12Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?”
13Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’