8Emesịa, Ebraham buuru mmiri ara ehi nke rahụrụ arahụ, na mmiri ara ehi, na anụ ahụ a kwadoro dozie ha nʼihu ndị ọbịa ahụ. O guzokwara nso nso ebe ha nọ nʼokpuru osisi ahụ mgbe ha na-eri nri.
9Ha jụrụ ya sị, “Ebee ka Sera nwunye gị nọ?” Ọ zara sị, “Ọ nọ nʼime ụlọ ikwu.”
10Ọ sịrị ya, “Nʼezie, mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a nʼafọ ọzọ, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.” Sera guzo nʼime ụlọ ikwu ahụ nke dị nʼazụ Ebraham na-ege ntị nʼihe ha na-ekwu.
11Nʼoge a, Ebraham na Sera emeela nnọọ agadi, gbaakwa isi awọ. Sera agafeela oge ịmụta nwa.
12Ya mere, mgbe Sera nụrụ ihe Onyenwe anyị kwuru, ọ chịrị ọchị sị, “Agadi nwanyị dịka m o si aṅaa amụta nwa, ugbu a onyenwe m karala nka?”