13Onyenwe anyị jụrụ Ebraham ajụjụ sị, “Gịnị mere Sera ji achị ọchị? Gịnị mere o ji kwuo sị, ‘Olee otu agadi nwanyị dịka m ga-esi mụọ nwa?’
14Ọ dị ihe nyịrị Onyenwe anyị ime? Mụ onwe m ga-alọghachikwute gị nʼoge a kara aka, Sera nwunye gị ga-amụta nwa nwoke.”
15Ma ụjọ tụrụ Sera. Nʼihi ya, ọ gọrọ agọ sị, “Achịghị m ọchị.” Ma Ọ zara sị, “Ọ bụ ezie, Sera, ị chịrị ọchị.”
16Mgbe ndị ikom atọ ahụ biliri ibidokwa ije ha, ha chere ihu ịga obodo Sọdọm, Ebraham dupụkwara ha.
17Mgbe ha na-aga nʼụzọ, Onyenwe anyị tulere sị, “O kwesiri ka m zochiere Ebraham ihe m chọrọ ime?