18Ebraham aghaghị ịbụ mba dị ukwuu dịkwa ike. A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na ya.
19Nʼihi na ahọpụtala m ya, ka ọ tụziere ụmụ ya na ụlọ ya ndị ga-esote ya ịgbaso ụzọ Onyenwe anyị site nʼime ihe dị mma na ihe ziri ezi, ka Onyenwe anyị mezuoro Ebraham ihe niile o kwere ya na nkwa.”
20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke.
21Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.”
22Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.