20Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru sị, “Mkpu akwa m na-anụ site na Sọdọm na Gọmọra dị ukwuu, otu a kwa, mmehie ha jọbigara njọ oke.
21Ugbu a, ana m aga ka m jiri anya m hụ ma ihe ha mere ọ dị njọ dịka mkpu akwa m na-anụ si dị. Ma o sighị otu ahụ dịrị, aga m amata.”
22Mgbe ahụ, ndị ikom abụọ nʼime ha gawara Sọdọm. Ma Ebraham nọ na-eguzo nʼihu Onyenwe anyị.
23Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume?
24Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya?