31O kwuru sị, “Ebe ọ bụ na m amalitela ịgwa gị, Onyenwe anyị okwu, biko kwere ka m gaa nʼihu. Ọ bụrụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ abụọ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi iri mmadụ abụọ ahụ agaghị m emebi ya.”
32Nʼikpeazụ, Ebraham kwuru sị, “Ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị. Ka m kwuo naanị otu ugboro a. Ọ bụrụkwanụ na a chọta naanị mmadụ iri nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Nʼihi mmadụ iri ahụ, agaghị m ebibi ya.”
33Mgbe Onyenwe anyị gwachara Ebraham okwu, ọ hapụrụ ya gawa ebe ọ na-aga. Ebraham laghachiri azụ nʼụlọ ya.