1Nʼoge anyasị, ndị mmụọ ozi abụọ ahụ bịarutere Sọdọm. Lọt nọ ala nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Mgbe ọ hụrụ ha, o biliri jekwuru ha, hulata ihu ya nʼala.
2Ọ sịrị, “Ndị nwe m, batanụ nʼụlọ ohu unu. Unu nwere ike saa ụkwụ unu, nọọkwa ọnọdụ abalị. Chi bọọ, unu nwere ike ibilikwa bido ịga nʼihu nʼije unu.” Ha zara sị, “Ee, anyị ga-edina nʼama.”
3Ma Lọt rịọsiri ha ike. Nʼikpeazụ ha sooro ya laa nʼụlọ ya. Ọ kwadooro ha ihe oriri, ya bụ achịcha na-ekoghị eko ka o ghere. Ha rikwara ya.