2O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala.
3Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị.
4Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a.
5Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.” Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.”
6Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.”