3Ọ sịrị, “Onyenwe m, ọ bụrụ na m natara amara nʼihu gị, agabigala ohu gị.
4Biko, ka ekutere unu mmiri ntakịrị, ka unu sachaa ụkwụ unu, zurukwa ike nʼokpuru osisi a.
5Ka m wetara unu nri ntakịrị unu ga-eri nke ga-agba unu ume tupu unu agawa nʼihu nʼije unu ugbu a unu bịara na nke ohu unu.” Ha zara sị ya, “Ọ dị mma. Mee dịka i kwuru.”
6Ya mere, Ebraham mere ngwangwa banyekwuru Sera nʼụlọ ikwu ya sị ya, “Mee ngwa, mapụta ihe ọtụtụ sịa atọ site na ọka a kwọrọ nke ọma jiri meta achịcha.”
7Mgbe ahụ, Ebraham gbagara nʼigwe ehi ya, họpụta otu nwa ehi na-akaghị aka nke ahụ ya dị mma, nye ya otu ohu ya onye mere ngwangwa gbuo ya, dozie ya maka oriri.