Jenesis 19

Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ.

Genesis 19:11 (UKJV) And they stroke the men that were at the door of the house with blindness, both small and great: so that they wearied themselves to find the door.

9Ha zara sị ya, “Pụọra anyị nʼụzọ. Mbịarambịa ka ị bụ! Leenụ mbịarambịa a! Ọ chọrọ ịbụ onye ikpe. Anyị mee gị ihe, ọ ga-ajọrọ gị njọ karịa ihe anyị ga-eme ha.” Ha nuru Lọt aka nughachi ya azụ, malite itiwa ọnụ ụzọ ụlọ ya.

10Ma ndị ikom ahụ nọ nʼụlọ Lọt, setịpụrụ aka ha dọbata ya nʼụlọ, ma mechie ụzọ ahụ.

11Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ.

12Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha!

13Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru Onyenwe anyị ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.