18Ma Lọt sịrị ha, “Mba, ndị nwe m, bikonu,
19ohu unu achọtala amara nʼihu unu, unu egosila m obi ebere dị ukwuu site nʼichebe ndụ m. Ma agaghị m enwe ike gbalaga nʼugwu ka mbibi a ghara ịdakwasị m, m nwụọ.
20Lee obodo dị nso nke m nwere ike ịgbaga. Ọ bụ obodo dị nta. Kwere ka m gbaga nʼebe ahụ. Obodo nta ka ọ bụ, ọ bụghị ya? Aga m echebekwa ndụ m na ya.”
21Ọ zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m emere gị dịka arịrịọ gị si dị. Agaghị m emebi obodo nta ahụ.
22Ma mee ngwangwa, nʼihi na o nweghị ihe ọbụla m ga-eme tutu ruo mgbe i ruru nʼebe ahụ.” (Ọ bụ nke a mere e ji akpọ aha obodo ahụ Zoa.)