Jenesis 19

Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.”

Genesis 19:32 (UKJV) Come, let us make our father drink wine, and we will lie with him, that we may preserve seed of our father.

30Emesịa, Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ hapụrụ obodo Zoa, nʼihi na ọ tụrụ egwu ibi nʼime Zoa. Ọ gara biri nʼime ọgba nkume ya na ụmụ ya ndị inyom abụọ.

31Otu ụbọchị, ada ya sịrị nke nta, “Nna anyị emeela agadi, ọ nwekwaghị nwoke ọbụla nọ nʼụwa a, onye ga-enye anyị ụmụ, dịka omenaala si dị nʼụwa niile.

32Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.”

33Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara.

34Nʼechi ya, ada gwara nwanne ya nke nta, “Mụ na nna anyị dinara nʼabalị gara aga. Ka anyị mee ka ọ ṅụọkwa mmanya nʼabalị taa, ka ị gaakwa ka gị na ya dina. Ka anyị mee ka agbụrụ anyị dịgide site na nna anyị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.