Jenesis 19

Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya,

Genesis 19:6 (UKJV) And Lot went out at the door unto them, and shut the door after him,

4Tupu ha abanye ịrahụ ụra, ndị ikom obodo ahụ, ndị ikom Sọdọm, bịara gbaa ụlọ ahụ gburugburu, ma ụmụ okorobịa ma ndị agadi, ndị niile si nʼakụkụ obodo ahụ.

5Ha kpọrọ Lọt oku sị ya, “Olee ebe ha nọ, bụ ndị ikom ahụ bịara nʼụlọ gị nʼabalị a? Kpọpụtara anyị ha ka anyị na ha dinakọọ.”

6Lọt pụkwuru ha nʼezi, mechie ụzọ ụlọ ya,

7sị ha, “Bikonu, ndị enyi m, unu emela ihe ọjọọ dị otu a.

8Leenụ, enwere m ụmụ nke aka m, ụmụ agbọghọ abụọ na-amaghị nwoke. Ka m kpọpụtara unu ha, ka unu mee ha ihe masịrị unu. Ma hapụnụ ndị ikom ndị a, nʼihi na ha bụ ndị batara izere ndụ nʼụlọ m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.