13Aha ngalaba nke abụọ bụ Gaihọn. O sitere nʼala Kush gafee.
14Aha osimiri nke atọ bụ Taịgris. Ọ na-asọla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ala Ashọ. Aha osimiri nke anọ bụ Yufretis.
15Onyenwe anyị Chineke weere mmadụ ahụ tinye ya nʼogige Iden, ka ọ na-akọ ya ma bụrụkwa onye na-elekọta ya.
16Onyenwe anyị Chineke nyere mmadụ ahụ iwu sị ya “I nwere ike iri mkpụrụ osisi niile dị nʼubi a,
17ma ị gaghị eri mkpụrụ si nʼosisi ịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Nʼihi na ụbọchị i riri ya ị ga-anwụrịrị.”