Jenesis 21

Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.

Genesis 21:19 (UKJV) And God opened her eyes, and she saw a well of water; and she went, and filled the bottle with water, and gave the lad drink.

17Ma Chineke nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi Chineke sikwa na mbara eluigwe kpọọ Hega oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na Chineke anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina.

18Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.”

19Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ.

20Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma.

21Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.