20Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma.
21Mgbe o bi nʼọzara Paran, nne ya chọtaara ya nwunye site nʼIjipt.
22Nʼoge a, Abimelek na Fikọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere Ebraham sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme.
23Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.”
24Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”