2Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.
3Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.
4Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu.
5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.
6Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.”