5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.
6Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.”
7O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”
8Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.
9Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo,