Jenesis 22

Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ,

Genesis 22:15 (UKJV) And the angel of the LORD called unto Abraham out of heaven the second time,

13Ebraham leliri anya hụ otu ebule nke eriri ọhịa jidere na mpi ya. Ebraham gara jide ebule ahụ, were ya chụọ aja nsure ọkụ nʼọnọdụ nwa ya nwoke.

14Ya mere, Ebraham kpọrọ ebe ahụ, “Onyenwe anyị ga-arọpụta.” Ya mere ruo taa a na-asị, “Nʼugwu Onyenwe anyị, a ga-arọpụta.”

15Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe kpọọ Ebraham oku nke ugboro abụọ,

16sị, “Mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị, ji onwe m na-aṅụ iyi na-ekwupụta sị, ebe ọ bụ na i mere ihe dị otu a, na i kwenyere iji nwa gị nwoke, naanị otu nwoke i nwere chụọrọ m aja,

17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.