Jenesis 22

Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba.

Genesis 22:19 (UKJV) So Abraham returned unto his young men, and they rose up and went together to Beersheba; and Abraham dwelt at Beersheba.

17aga m agọzi gị nʼezie, mekwa ka ụmụ ụmụ gị mụbaa nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando nke mbara eluigwe na dịka aja dị nʼọnụ mmiri osimiri. Ụmụ ụmụ gị ga-enwetara onwe ha ọnụ ụzọ ama ndị iro ha.

18Sitekwa na mkpụrụ gị ka a ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa, nʼihi na i rubeere m isi.”

19Emesịa, Ebraham laghachikwuru ndị na-ejere ya ozi. Ha niile laghachikwara Bịasheba. Ebraham birikwara na Bịasheba.

20Mgbe ihe ndị a gasịrị, e ziri Ebraham ozi si ya, “Lee, Milka ya onwe ya amụkwaarala nwanne gị nwoke bụ Nahọ, ụmụ ndị ikom.

21Aha ha bụ Uz, onye bụ ọkpara, na Buz nwanne ya, Kemuel bụ (nna Aram),

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.