Jenesis 22

Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?”

Genesis 22:7 (UKJV) And Isaac spoke unto Abraham his father, and said, My father: and he said, Here am I, my son. And he said, Behold the fire and the wood: but where is the lamb for a burnt offering?

5Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi sị, “Nọdụnụ nʼebe a, unu na ịnyịnya ibu anyị, ka mụ na nwokorobịa a gaa nʼebe ahụ. Anyị feecha ofufe, anyị ga-alọghachikwute unu ọzọ.”

6Ebraham boro nwa ya nwoke Aịzik ukwu nkụ ahụ e ji achụ aja nsure ọkụ nʼisi, ma ya onwe ya jidere ọkụ na mma.

7Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?”

8Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.

9Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.