Jenesis 22

Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.

Genesis 22:9 (UKJV) And they came to the place which God had told him of; and Abraham built an altar there, and laid the wood in order, and bound Isaac his son, and laid him on the altar upon the wood.

7Aịzik gwara nna ya Ebraham sị, “Nna m.” Ebraham zara, “Ehee, nwa m.” Aịzik sịrị, “Ọkụ na nkụ dị nʼebe a, olee nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ?”

8Ebraham zara, “Nwa m, Chineke nʼonwe ya ga-eweta nwa atụrụ e ji achụ aja nsure ọkụ.” Ha abụọ gakwara nʼihu nʼije ha.

9Mgbe ha ruru ebe ahụ Chineke gwara ya maka ya, Ebraham wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ, doo nkụ ndị ahụ niile nʼusoro nʼelu ya. O kere nwa ya Aịzik agbụ, tụkwasị ya nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, na nʼelu nkụ ndị ahụ.

10Mgbe ahụ Ebraham setịpụrụ aka ya, welite mma ka o gbuo nwa ya nwoke.

11Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị si nʼeluigwe kpọọ ya oku sị ya, “Ebraham! Ebraham!” Ebraham zara, “Lekwa m nʼebe a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.