1Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa.
2Ọ nwụrụ na Kiriat Arba (nke bụ Hebrọn), nʼala Kenan. Ebraham ruru ụjụ nʼihi Sera, kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya.
3Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ Het gwa ha sị,
4“Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.”