Jenesis 24

O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ.

Genesis 24:11 (UKJV) And he made his camels to kneel down without the city by a well of water at the time of the evening, even the time that women go out to draw water.

9Ya mere, ohu ahụ tinyere aka ya nʼokpuru apata nna ya ukwu Ebraham, ṅụọ iyi banyere okwu ndị a.

10Emesịa, ohu a duuru ịnyịnya kamel iri nʼime ndị nna ya ukwu nwere pụọ. O sitekwara nʼaka nna ya ukwu were ihe ọma dị iche iche maka njem a, gawa Aram Naharaim, rute nʼobodo Nahọ.

11O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ.

12Mgbe ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, mee ka ihe gaara m nke ọma taa. Gosi nna m ukwu Ebraham obi ebere gị.

13Lee, ana m eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ụmụ nwanyị ndị obodo a na-abịa iseta mmiri.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.