17Ohu ahụ mere ngwangwa jekwuru ya sị ya, “Biko nyetụ m mmiri si nʼite mmiri gị.”
18Ọ mere ngwangwa budata ite ahụ nʼaka ya, hulata ya si ya, “Ṅụọ, onyenwe m.”
19Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị, “Aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”
20Ngwangwa, ọ wụpụrụ mmiri dị nʼite ya nʼime ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri, gbara ọsọ gaa kute mmiri ọzọ na-agbanye nʼime ihe ahụ. O kugidere mmiri tutu ruo mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụjuchara afọ.
21Mgbe ihe ndị a na-eme, ohu ahụ gbara nkịtị na-ele ya anya ịchọpụta ma Onyenwe anyị emeela ka ije ya bụrụ ihe gara nke ọma.