Jenesis 24

“Tupu m kpesịa ekpere a nʼobi m, lekwa Ribeka ka o bụ ite mmiri ya nʼubu ya na-abịa. Ọ gbadara nʼisi iyi mmiri ahụ kute mmiri. Asịrị m ya, ‘Biko nye m mmiri ka m ṅụọ.’

Genesis 24:45 (UKJV) And before I had done speaking in mine heart, behold, Rebekah came forth with her pitcher on her shoulder; and she went down unto the well, and drew water: and I said unto her, Let me drink, I pray you.

43Lee, ka m na-eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ka nwaagbọghọ ahụ bịara ikuru mmiri nke m ga-asị, “Biko kwere ka m si nʼite gị ṅụrụtụ ntakịrị mmiri,”

44ma ọ bụrụ na ọ sị m, “Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a,” ka onye dị otu a bụrụ nwanyị ahụ Onyenwe anyị chọtaara Aịzik nwa nna m ukwu.’

45“Tupu m kpesịa ekpere a nʼobi m, lekwa Ribeka ka o bụ ite mmiri ya nʼubu ya na-abịa. Ọ gbadara nʼisi iyi mmiri ahụ kute mmiri. Asịrị m ya, ‘Biko nye m mmiri ka m ṅụọ.’

46“Ngwangwa, o sitere nʼubu ya budata ite, sị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel ndị a ga-aṅụ.’ Ya mere, aṅụrụ m, o nyekwara ịnyịnya kamel m ndị ahụ mmiri ha ṅụrụ.

47“Mgbe ahụ, ajụrụ m ya, ‘Nwa onye ka ị bụ?’ “Ọ sịrị m, ‘Abụ m nwa Betuel onye bụ nwa Nahọ nke Milka mụtaara ya.’ “Mgbe ahụ etinyere m ya mgbanimi ahụ nʼimi ya, tinyekwa ọlaaka ahụ nʼaka ya abụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.