4Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.”
5Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?”
6Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ.
7Onyenwe anyị, Chineke nke eluigwe, bụ onye kpọpụtara m site nʼụlọ nna m nakwa obodo nke aka m, onye ahụ gwara m okwu ma kwem nkwa site nʼịṅụ iyi nye sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ gị ala a.’ Ọ ga-ezipụ mmụọ ozi ya ka ọ gaa nʼihu gị ka i nwee ike inwetara nwa m nwoke nwunye site nʼebe ahụ.
8Ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ achọghị isoro gị lọghachi, mgbe ahụ, ị ga-abụ onye nwere onwe ya pụọ nʼiyi a ị ṅụrụ. Naanị na ị gaghị eme ka nwa m nwoke laghachi nʼebe ahụ.”