2Ọ gwara onyeisi ndị ozi nʼụlọ ya, onye nke na-elekọta ihe niile o nwere sị ya, “Tinye aka gị nʼokpuru apata m.
3Achọrọ m ka i jiri aha Onyenwe anyị Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọra m iyi, na ị gaghị achọtara nwa m nwoke nwunye site nʼetiti ndị Kenan, ndị m bi nʼetiti ha.
4Kama na ị ga-aga nʼala nke m na ụmụnna m lụtara nwa m, bụ Aịzik, nwunye nʼetiti ụmụnna m.”
5Ohu ahụ jụrụ ya, “Ọ bụrụkwanụ na nwaagbọghọ ahụ achọghị isoro m lọghachi nʼebe a, m ga-akpọrọ nwa gị nwoke laghachi nʼobodo i si bịa?”
6Ebraham sịrị ya, “Lezie anya hụ na ị kpọghachighị nwa m nwoke nʼebe ahụ.