17Ishmel biri ndụ ruo narị afọ na iri afọ na asaa. Ọ nwụrụ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.
18Ụmụ ụmụ ya bi nʼala dị site na Havila ruo Shua nso nso oke ala ndị Ijipt, nʼụzọ e si aga Ashọ. Ha na ụmụnna ha ndị ọzọ ebighị nʼudo.
19Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik.
20Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram.
21Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.