Jenesis 25

Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.

Genesis 25:21 (UKJV) And Isaac implored the LORD for his wife, because she was barren: and the LORD was implored of him, and Rebekah his wife conceived.

19Nke a bụ akụkọ banyere usoro agbụrụ Aịzik nwa Ebraham. Ebraham bụ nna Aịzik.

20Aịzik gbara iri afọ anọ mgbe ọ lụrụ Ribeka, nwa Betuel, onye Aram si nʼobodo Padan Aram, nwanne Leban, onye Aram.

21Aịzik kpere ekpere rịọọ Onyenwe anyị ka o nye nwunye ya nwa nʼihi na ọ bụ nwanyị aga. Onyenwe anyị zara ekpere ya. Nwunye ya, Ribeka dịịrị ime.

22Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka Onyenwe anyị.

23Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.