27Ha abụọ toro, Ịsọ ghọrọ onye ọka nʼịchụ nta, onye na-epiogharị nʼọhịa, ebe Jekọb bụ nwoke dị nwayọọ, onye na-anọ nʼetiti ụlọ ikwu.
28Aịzik hụrụ Ịsọ nʼanya nʼihi na ụtọ anụ Ịsọ na-egbute nʼọhịa na-adị ya mma, ma Ribeka hụrụ Jekọb nʼanya.
29Otu ụbọchị, Jekọb nọ na-esi ofe mgbe Ịsọ si nʼọhịa bata. Agụụ na-agụkwa ya nke ukwuu.
30Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.)
31Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.”