30Ịsọ rịọrọ Jekọb sị, “Nyetụ m ụfọdụ nʼime nri a na-acha uhie uhie ị na-esi ka m rie, nʼihi na agụụ na-agụ m hie nne.” (Ọ bụ ihe a mere e ji na-akpọ ya Edọm.)
31Ma Jekọb zara ya, “Buru ụzọ resi m ọnọdụ ịbụ ọkpara gị.”
32Ịsọ sịrị, “Gịnị bụ uru ọnọdụ ịbụ ọkpara bara mgbe m na-anwụ nʼagụụ?”
33Jekọb sịrị ya, “Buru ụzọ ṅụọrọ m iyi.” Ya mere, ọ ṅụụrụ ya iyi, sị otu a resi Jekọb ọnọdụ ọkpara ya.
34Mgbe ahụ, Jekọb nyere Ịsọ achịcha na ofe lentil o siri. O riri, ṅụọkwa, bilie ọtọ pụọ. Ya mere Ịsọ ledara ọnọdụ ịbụ ọkpara nna ya anya.