3Jokshan bụ nna Sheba na Dedan. Ụmụ ndị ikom Dedan bụ Ashurim, Letushim, na Leumim.
4Ụmụ ndị ikom Midian bụ Efaa, Efe, Hanok, Abida, na Eldaa. Ndị a niile bụ ụmụ Ketura.
5Ebraham nyere Aịzik ihe niile o nwere.
6Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso.
7Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise.