5Ebraham nyere Aịzik ihe niile o nwere.
6Ebraham nyere ụmụ ndị ikom ndị iko ya nwanyị mụtara onyinye dị iche iche, zipụ ha nʼala dị nʼebe ọwụwa anyanwụ, mgbe ọ ka nọ ndụ, ka ha ghara ịnọ nwa ya nwoke Aịzik nso.
7Ebraham dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ asaa na ise.
8Ebraham kubiri ume ndụ nwụọ mgbe o mere nnọọ ezigbo agadi, agadi nwoke nke ndụ juru afọ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.
9Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het,