Jenesis 26

O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ.

Genesis 26:18 (UKJV) And Isaac dug again the wells of water, which they had dug in the days of Abraham his father; for the Philistines had stopped them after the death of Abraham: and he called their names after the names by which his father had called them.

16Abimelek kpọrọ Aịzik sị ya, “Si nʼala a kwapụ gaa nʼebe ọzọ, nʼihi na ịba ụba gị na ịdị ike gị adịla ukwuu karịa nke anyị.”

17Ya mere Aịzik si nʼebe ahụ kwapụ, gaa maa ụlọ ikwu ya na Ndagwurugwu Gera, biri nʼebe ahụ.

18O gwugharịkwara olulu mmiri ndị ahụ e gwuru nʼoge nna ya Ebraham, nke ndị Filistia kpojuru aja mgbe Ebraham nwụrụ, kpọọ olulu mmiri ndị a otu aha ahụ nna ya kpọrọ ha na mbụ.

19Ọzọ, ndị na-ejere Aịzik ozi gwuru olulu mmiri ọhụrụ na ndagwurugwu Gera ahụ, gwute mmiri nke si nʼala na-asọpụta.

20Ma ndị ọzụzụ anụ ụlọ obodo Gera sesịrị ndị ọzụzụ anụ ụlọ Aịzik okwu. Ha kwuru sị, “Mmiri a bụ nke anyị!” Nke a mere Aịzik ji kpọọ olulu mmiri ahụ Esek, nʼihi ise okwu nke ha sesịrị ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.