22O si nʼebe ahụ pụọ gaa nʼebe ọzọ gwuo olulu mmiri ọzọ. Ma o nweghị ndị bịara zọọ ya. Nʼihi ya ọ kpọrọ olulu mmiri ahụ Rehobọt. O kwuru sị, “Ugbu a, Onyenwe anyị enyela anyị ebe sara mbara, ebe ihe ga-anọ gaara anyị nke ọma.”
23O sitere nʼebe ahụ kwapụ gaa Bịasheba.
24Nʼabalị ahụ, Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ya anya, sị ya, “Abụ m Chineke nna gị Ebraham. Atụla egwu, nʼihi na anọnyere m gị, aga m agọzi gị, mụbaa ọnụọgụgụ ụmụ ụmụ gị nʼihi ohu m Ebraham.”
25Ya mere, o wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. Ọ makwara ụlọ ikwu ya nʼebe ahụ. Ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri.
26Abimelek na Ahuzat, onye ndụmọdụ ya, na Fikọl onyeisi ndị agha ya sitere Gera jekwuru Aịzik.