Jenesis 26

Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị.

Genesis 26:3 (UKJV) Sojourn in this land, and I will be with you, and will bless you; for unto you, and unto your seed, I will give all these countries, and I will perform the oath which I swore unto Abraham your father;

1Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek eze ndị Filistia nʼobodo Gera.

2Onyenwe anyị gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya.

3Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị.

4Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa.

5Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.