1Mgbe Aịzik ghọrọ agadi, nʼoge anya ya na-adịghị ahụzi ụzọ nke ọma, ọ kpọrọ Ịsọ ọkpara ya, sị ya, “Nwa m nwoke.” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”
2Aịzik gwara ya sị, “Ugbu a, emeela m agadi, amakwaghị m ụbọchị ọnwụ m.
3Ya mere, were ihe ịchụ nta gị, ụta gị na àkụ gị, gaa nʼọhịa, gbutere m anụ.