12Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.”
13Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.”
14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya.
15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb.
16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.