14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya.
15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb.
16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.
17O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere.
18O jekwuuru nna ya sị ya, “Nna m.” Ọ zara sị, “Ahaa, nwa m, onye ka ị bụ?”