15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb.
16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.
17O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere.
18O jekwuuru nna ya sị ya, “Nna m.” Ọ zara sị, “Ahaa, nwa m, onye ka ị bụ?”
19Jekọb zara nna ya sị ya, “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị. Emeela m ihe ị sị m mee. Biko bilie ka i rie anụ m gbutere nʼọhịa, ka gị onwe gị gọzie m.”