Jenesis 27

Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.”

Genesis 27:31 (UKJV) And he also had made savoury food, and brought it unto his father, and said unto his father, Let my father arise, and eat of his son's venison, that your soul may bless me.

29Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi, ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị. Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ, ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị. Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ, ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.”

30Mgbe Aịzik gọzichara Jekọb, ka Jekọb si nʼihu ya na-apụ, lee Ịsọ ka o si ịchụ nta na-alọbata.

31Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.”

32Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.”

33Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.