31Ya onwe ya sikwara nri na-atọ ụtọ butere nna ya. Mgbe ahụ, ọ gwara ya sị, “Ka nna m, bilie, rie anụ nwa ya si nʼọhịa gbute, ka gị onwe gị nye m ngọzị gị.”
32Aịzik zara sị ya, “Ị bụ onye?” Ọ zara sị, “Abụ m nwa gị nwoke Ịsọ, ọkpara gị Ịsọ.”
33Oke ahụ ọma jijiji mara Aịzik, ọ sị, “Onye kwanụ bụ onye ahụ gara gbute anụ butere m ya? Eriri m ya tupu ị bata. Agọziri m ya. Nʼezie, onye a gọziri agọzi ka ọ ga-abụ.”
34Mgbe Ịsọ nụrụ okwu ndị a si nʼọnụ nna ya, o jiri oke olu kwaa akwa nke obi ilu gwa nna ya sị ya, “Gọzie m, mụ onwe m, nna m.”
35Ma ọ zara sị ya, “Nwanne gị ejirila ụzọ aghụghọ bịa nara ngọzị gị.”