36Ịsọ kwuru sị, “E meziri kpọọ ya Jekọb, onye aghụghọ. Lee, ọ ghọgbuola m ugboro abụọ. Nke mbụ, ọ naara m ọnọdụ ịbụ ọkpara m, ugbu a ọ narakwala m ngọzị m.” Ọ jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na i nweghị ngọzị ọ bụla fọdụrụ nke ị ga-agọzi m?”
37Aịzik zara sị ya, “Emeela m ya ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ị nọ, mee ụmụnna ya niile ndị na-ejere ya ozi. Enyela m ya mkpụrụ ubi niile na mmanya ọhụrụ. Gịnị ọzọ ka m nwere ike imere gị, nwa m nwoke?”
38Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu.
39Nna ya Aịzik zara sị ya, “Ebe obibi gị ga-adịpụ adịpụ, site nʼebe akụnụba nke ala dị, site nʼebe igirigi nke eluigwe dị.
40Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha, ị ga-ejekwara nwanne gị ozi. Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị, ị ga-atọpụ agbụ ya, site nʼolu gị.”