38Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu.
39Nna ya Aịzik zara sị ya, “Ebe obibi gị ga-adịpụ adịpụ, site nʼebe akụnụba nke ala dị, site nʼebe igirigi nke eluigwe dị.
40Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha, ị ga-ejekwara nwanne gị ozi. Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị, ị ga-atọpụ agbụ ya, site nʼolu gị.”
41Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb.”
42Mgbe a gwara Ribeka ihe nwa ya nwoke nke okenye bụ Ịsọ kwuru, o ziri kpọọ nwa ya nwoke nke nta bụ Jekọb sị ya, “Lee, Ịsọ nwanne gị na-akasị onwe ya obi site nʼechiche ọ na-eche igbu gị.