2Aịzik gwara ya sị, “Ugbu a, emeela m agadi, amakwaghị m ụbọchị ọnwụ m.
3Ya mere, were ihe ịchụ nta gị, ụta gị na àkụ gị, gaa nʼọhịa, gbutere m anụ.
4Siere m nri ụtọ otu ahụ o si amasị m, butere m ya ka m rie, ka mụ onwe m gọzie gị tupu m nwụọ.”
5Ma Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Nke mere na mgbe Ịsọ gawara nʼọhịa ịchụ nta,
6Ribeka gwara Jekọb nwa ya okwu sị ya, “Lee, anụrụ m ka nna gị na-agwa nwanne gị Ịsọ okwu sị ya,