44Nọdụ nʼebe ahụ ruo mgbe iwe nwanne gị ga-adajụ.
45Mgbe nwanne gị kwụsịrị iwe iwe megide gị, mgbe o chefuru ihe i mere ya, aga m ezitere gị ozi ka ị lọta. Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbara aka unu abụọ nʼotu ụbọchị.”
46Mgbe ahụ Ribeka gara gwa Aịzik sị, “Ike ịdị ndụ agwụla m nʼihi ndị inyom Het ndị a. Ọ bụrụ na Jekọb esite nʼetiti ndị inyom ala a, site nʼetiti ndị inyom Het ndị a lụọ nwunye, mara na ọnwụ ga-akara m ịdị ndụ mma.”