14Ụmụ gị ga-adị ukwuu, dị ka aja dị nʼala. Ha ga-ejupụta ala a, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, sitekwa nʼugwu ruo na ndịda. A ga-esitekwa na gị na mkpụrụ gị, gọzie mba niile nke ụwa a.
15Anọnyeere m gị. Aga m echebe gị ebe ọbụla ị na-aga. Aga m akpọghachite gị nʼala a. Agaghị m ahapụ gị tutu ruo mgbe m mezuoro gị ihe niile m kwere gị na nkwa.”
16Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.”
17Ọ tụrụ egwu sị, “Lee ka ebe a si dị oke egwu, o nweghị ihe ebe a bụ karịa ụlọ Chineke, nʼezie ọ bụ ọnụ ụzọ ama eluigwe.”
18Nʼisi ụtụtụ echi ya, Jekọb weere nkume ahụ o hinyere nʼisi ya guzo ya dịka ogidi, wụsa mmanụ nʼelu ya.